Native Bible

Leviticus 19:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.

Leviticus 19:17 in English

Leviticus 19:17 · Berean Standard Bible

You must not harbor hatred against your brother in your heart. Directly rebuke your neighbor, so that you will not incur guilt on account of him.

Context

15“ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ. 16“ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m Onyenwe anyị. 17“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya. 18“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị unu. 19“ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.