Native Bible

Leviticus 18:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya.

Leviticus 18:15 in English

Leviticus 18:15 · Berean Standard Bible

You must not have sexual relations with your daughter-in-law. She is your son’s wife; you are not to have sexual relations with her.

Context

13“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanne nne gị nke nwanyị, ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na ọbara jịkọrọ ya na nne gị, ha bụ otu ahụ. 14“ ‘Ị gaghị eleda nwanne nna gị nke nwoke anya, site nʼijekwuru nwunye ya, ka gị na ya nwe mmekọ edina. Nʼihi na nwunye nwanna gị ka ọ bụ. 15“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwa gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina; nwunye nwa gị nwoke ka ọ bụ; gị na ya agaghị enwe mmekọrịta ọbụla gosiri mkpughe ọtọ ya. 16“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwunye nwanne gị nwoke ka gị na ya nwe mmekọ edina, nʼihi na nke a bụ omume nleda anya nye nwanne gị nwoke. 17“ ‘Ị gaghị e jekwuru nwanyị na nwa ya nwanyị ka gị na ha nwe mmekọ edina. Ị gaghị akpọrọ nwa nwanyị nwa ya nwoke, maọbụ nwa nwanyị nke nwa ya nwanyị mụrụ dinaa ya; nʼihi na otu ọbara ka ha bụ. Ihe dị otu a bụ arụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.