Native Bible

Leviticus 16:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ.

Leviticus 16:5 in English

Leviticus 16:5 · Berean Standard Bible

And he shall take from the congregation of Israel two male goats for a sin offering and one ram for a burnt offering.

Context

3“Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, 4Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha,* ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha. 5Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ Izrel nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ. 6“Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya. 7Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu Onyenwe anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.