Native Bible

Leviticus 16:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ.

Leviticus 16:32 in English

Leviticus 16:32 · Berean Standard Bible

The priest who is anointed and ordained to succeed his father as high priest shall make atonement. He will put on the sacred linen garments

Context

30Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu Onyenwe anyị. 31Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe! 32Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ. 33Ọ ga-ekpuchiri Ebe ahụ Kachasị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha. 34“Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị Izrel niile.” E mezuru ihe ndị a niile dịka Onyenwe anyị si nye ya Mosis nʼiwu. 16:4 Ndị nchụaja na-eyipụ uwe ije ozi ha, hapụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, mgbe ha jesiri ozi. Izk 44:17-19 16:23 Izk 42:14 16:29 Lev 23:27,32; Ọnụ 29:7

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.