Levitikọs 16:24
Leviticus 16:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha.
Leviticus 16:24 in English
Leviticus 16:24 · Berean Standard Bible
He is to bathe himself with water in a holy place and put on his own clothes. Then he must go out and sacrifice his burnt offering and the people’s burnt offering to make atonement for himself and for the people.
Context
22Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara. 23“Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ,* yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ. 24Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha. 25Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. 26“Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga-asa ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.