Native Bible

Leviticus 14:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya.

Leviticus 14:47 in English

Leviticus 14:47 · Berean Standard Bible

And anyone who sleeps in the house or eats in it must wash his clothes.

Context

45Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 46“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi. 47Onye ọbụla dinara ala maọbụ rie nri nʼime ya, ga-asacha uwe ya. 48“Ma ọ bụrụ na onye nchụaja abịa hụ na ntụpọ ahụ apụtaghị ọzọ, mgbe e techara ụlọ ahụ ụrọ nke ugboro abụọ, ọ ga-agụ ya nʼụlọ dị ọcha, nʼihi na ọrịa ahụ na-efe efe alaala. 49Ọ ga-ejikwa nnụnụ abụọ, na osisi sida, na ogho uhie, na osisi hisọp mee mmemme ido ihe ọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.