Levitikọs 14:44
Leviticus 14:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe.
Leviticus 14:44 in English
Leviticus 14:44 · Berean Standard Bible
the priest must come and inspect it. If the mildew has spread in the house, it is a destructive mildew; the house is unclean.
Context
42A ga-ebute nkume ọzọ jiri ha dochie ndị ahụ e bupụsịrị. A ga-ejikwa ụrọ ọhụrụ tee ụlọ ahụ ọzọ. 43“Ma ọ bụrụ na ntụpọ ahụ apụta ọzọ, mgbe e bupụsịrị nkume ndị ahụ, ma mgbe a kpuchasịrị aja ụlọ ma techikwaa ya, 44onye nchụaja ga-abịa lee ya. Ọ bụrụ na ọ hụ na ntụpọ ahụ agbasaala ọzọ, ọ ga-agụ ụlọ ahụ dịka ihe rụrụ arụ, nʼihi na ntụpọ ahụ bụ ọrịa na-efe efe. 45Ọ ga-enye iwu ka a kwatuo ụlọ ahụ bufukwaa ihe niile e jiri rụọ ya, nkume niile, osisi niile na ụrọ niile, nʼebe a na-ekpofu ihe rụrụ arụ nʼazụ obodo. 46“Onye ọbụla banyere nʼụlọ ahụ nʼoge e mechiri ya, ga-abụ onye rụrụ arụ ruo nʼoge uhuruchi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.