Native Bible

Leviticus 13:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,

Leviticus 13:1 in English

Leviticus 13:1 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Moses and Aaron,

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, 2“Mgbe mmadụ hụrụ etuto, maọbụ ọnya, maọbụ ntụpọ na-eko eko nʼakpụkpọ anụ ahụ ya nke dị ka ihe ọrịa ekpenta na-eweta, a ga-eduru onye ahụ bịa nʼihu Erọn onye nchụaja maọbụ ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị nchụaja. 3Onye nchụaja ga-eleru ọrịa ahụ dị ya nʼahụ anya. Ọ bụrụ na ajị dị gburugburu ebe ahụ ebidola ịcha ọcha, ọ bụrụkwa na ebe ahụ mibara ime, ọ bụ ọrịa ekpenta. Mgbe onye nchụaja leruchara ya anya, ọ ga-ekwupụta na onye ahụ bụ onye rụrụ arụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.