Levitikọs 11:36
Leviticus 11:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
Leviticus 11:36 in English
Leviticus 11:36 · Berean Standard Bible
Nevertheless, a spring or cistern containing water will remain clean, but one who touches a carcass in it will be unclean.
Context
34Ihe oriri ọbụla nke mmiri si nʼite a metụrụ abụrụla ihe rụrụ arụ. Mmiri ọṅụṅụ ọbụla dị nʼime ite ahụ rụkwara arụ. 35Ihe ọbụla ozu anụmanụ dị otu a dakwasịrị, maọbụ ite ọkụ eji eghe ihe, maọbụ ekwu a ga-etiwa ha. Nʼihi na ha bụ ihe rụrụ arụ, unu ga-agụ ha dịka ihe rụrụ arụ. 36Ọ bụrụkwa na ozu anụmanụ ahụ adaba nʼisi iyi, maọbụ nʼolulu mmiri, mmiri ahụ ga-adị ọcha, kama onye ga-emetụ anụ ahụ aka ga-abụ onye rụrụ arụ. 37Ọ bụrụ na ozu anụ ahụ adakwasị mkpụrụ ubi a na-aga ịkụ nʼubi, ọ gaghị emerụ ha. 38Ma ọ bụrụ na e tinyere mmiri nʼelu mkpụrụ ọghịgha ndị ahụ, ozu adakwasị nʼelu ya, ha ga-abụ ihe rụrụ arụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.