Levitikọs 11:28
Leviticus 11:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
Leviticus 11:28 in English
Leviticus 11:28 · Berean Standard Bible
and anyone who picks up a carcass must wash his clothes, and he will be unclean until evening. They are unclean for you.
Context
26“ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ. 27Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 28Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ. 29“ ‘Nʼime anụmanụ niile na-enupụta enupụta nʼala, anụmanụ ndị a bụ ndị rụrụ arụ: nkapi, na oke, na agụ iyi dịka ụdị ha si dị, 30na ọba mmiri,* na ngwere aghụ, na ngwere, na ngwere uzuzu, na ogumagala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.