Levitikọs 11:26
Leviticus 11:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ.
Leviticus 11:26 in English
Leviticus 11:26 · Berean Standard Bible
Every animal with hooves not completely divided * or that does not chew the cud is unclean for you. Whoever touches any of them will be unclean.
Context
24“ ‘Iri ha ga-eme ka unu rụọ arụọ. Onye ọbụla metụrụ ozu ha aka ga-abụ onye rụrụ arụ site nʼoge o bitụrụ ha aka tutu ruo nʼabalị nke ụbọchị ahụ. 25Onye ọbụla metụrụ otu nʼime ozu ha aka ga-asakwa uwe ya, gụọkwa onwe ya dịka onye na-adịghị ọcha ruo uhuruchi. 26“ ‘Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya na-awasaghị abụọ, maọbụ nke na-adịghị atagharị nri ya ugboro abụọ, rụrụ arụ. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ. 27Nʼime anụmanụ niile na-aga ije nʼụkwụ anọ, anụmanụ ọbụla na-aga ije nʼọbụaka ya rụrụ arụ, unu agaghị eri ya. Onye ọbụla metụrụ ozu ya aka ga-abụ onye rụrụ arụ ruo uhuruchi. 28Onye ọbụla ga-ebu ozu ya ga-asa uwe ya, bụrụkwa onye rụrụ arụ ruo uhuruchi, nʼihi na ọ bụ ihe rụrụ arụ nʼebe unu nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.