Native Bible

Leviticus 10:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa.

Leviticus 10:9 in English

Leviticus 10:9 · Berean Standard Bible

“You and your sons are not to drink wine or strong drink when you enter the Tent of Meeting, or else you will die; this is a permanent statute for the generations to come.

Context

7Ọzọ, unu ahapụla ọnụ ụzọ ụlọ nzute, ka unu ghara ịnwụ, nʼihi na mmanụ nsọ nke Onyenwe anyị dị nʼahụ unu.” Ha mere dịka Mosis gwara ha. 8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn sị, 9“Gị na ụmụ gị ndị ikom agaghị aṅụ mmanya, maọbụ ihe ọṅụṅụ ọbụla na-aba nʼanya mgbe unu na-aba nʼụlọ nzute ka unu ghara ịnwụ. Agbụrụ unu niile ga-esogide iwu a ruo ọgbọ niile na-abịa. 10Ọrụ unu ka ọ bụ ịkpa oke nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, na nʼetiti ihe dị ọcha na ihe na-adịghị ọcha. 11Ọrụ unu bụkwa izi ụmụ Izrel ụkpụrụ niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼaka Mosis.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.