Native Bible

Leviticus 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị.

Leviticus 1:9 in English

Leviticus 1:9 · Berean Standard Bible

The entrails and legs must be washed with water, and the priest shall burn all of it on the altar as a burnt offering, an offering made by fire, a pleasing aroma to the LORD.

Context

7Ụmụ Erọn, ndị nchụaja ga-etinye ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ, doo nkụ nʼusoro nʼelu ya. 8Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ndị nchụaja ga-atụkwasị akụkụ ehi ahụ niile, na isi ya, na abụba ya, nʼelu nkụ ahụ na-enwu ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. 9Ma a ga-asacha ihe ndị dị nʼime afọ ya, na ụkwụ ya mmiri. Onye nchụaja ga-akpọ ha niile ọkụ nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ bụ onyinye aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ nke dị ezi ụtọ nye Onyenwe anyị. 10“ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja nsure ọkụ ahụ si nʼigwe ewu na atụrụ, ọ ga-abụrịrị mkpi maọbụ ebule na-enweghị nkwarụ. 11Onye wetara ya ga-egbu ya nʼihu Onyenwe anyị nʼakụkụ ebe ịchụ aja chere ihu nʼugwu. Ụmụ ndị ikom Erọn, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.