Native Bible

Leviticus 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ.

Leviticus 1:16 in English

Leviticus 1:16 · Berean Standard Bible

And he is to remove the crop with its contents * and throw it to the east side of the altar, in the place for ashes.

Context

14“ ‘Ọ bụrụ na onyinye ọ na-enye Onyenwe anyị dịka aja nsure ọkụ bụ site nʼụmụ anụ ufe, ọ ghaghị ịbụ nduru, maọbụ nwa kpalakwukwu. 15Onye nchụaja ga-ewebata anụ ufe ahụ nʼebe ịchụ aja, tụbipụ isi ya, wụsa ọbara ya nʼakụkụ ebe ịchụ aja. 16Ọ ga-ewepụ akpa nri ya, na ihe dị ya nʼime, tụnye ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja ahụ; ebe a na-ekposa ntụ. 17Ọ ga-ejide nku ya abụọ nyawaa ha, ma ọ gaghị anyakapụcha ha. Mgbe ahụ, onye nchụaja ahụ ga-akpọ ya ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. Ọ bụ aja nsure ọkụ, onyinye e nyere site nʼọkụ, nke isisi ya dị Onyenwe anyị ezi ụtọ. 1:3 Aja nsure ọkụ Ọ bụ ụzọ anụ atọ ka a na-eji achụ aja nsure ọkụ, nke a na-adaba dịka aka si ruo onye ahụ na-achụ aja. Nke mbụ bụ ehi, nke dịrị ndị ọgaranya. Ọzọkwa, bụ ewu na atụrụ, ma banyere ndị ogbenye, ihe ha ga-eweta bụ nnụnụ nduru ma ọ bụ kpalakwukwu. Lev 1:3,10,14; 5:7; 12:8; Luk 1:24

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.