Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ndị Gibiọn* nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai,

Joshua 9:3 in English

Joshua 9:3 · Berean Standard Bible

But the people of Gibeon, having heard what Joshua had done to Jericho and Ai,

Context

1Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus, 2ha niile zukọtara ibu agha megide Joshua na ụmụ Izrel. 3Ma mgbe ndị Gibiọn* nụrụ ihe Joshua mere Jeriko na Ai, 4ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha. 5Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.