Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ.

Joshua 9:21 in English

Joshua 9:21 · Berean Standard Bible

They continued, “Let them live, but let them be woodcutters and water carriers for the whole congregation.” So the leaders kept their promise.

Context

19Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla. 20Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.” 21Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ. 22Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso? 23Ugbu a, unu ga-abụ ndị a bụrụ ọnụ. Site nʼụbọchị taa gaa nʼihu, unu aghọọla ndị ohu anyị, ndị ga na-awara anyị nkụ mgbe niile, na ndị ga na-ekutere anyị mmiri nke anyị ga-eji rụọ ọrụ nʼụlọnsọ Chineke m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.