Joshua 9:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.”
Joshua 9:20 in English
Joshua 9:20 · Berean Standard Bible
This is how we will treat them: We will let them live, so that no wrath will fall on us because of the oath we swore to them.”
Context
18Ma ndị Izrel ebusoghị ha agha nʼihi na ndịisi nzukọ Izrel ejirila aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel ṅụọ iyi idebe ha ndụ.
Ma nzukọ Izrel niile tamuru ntamu megide ndịisi ha nʼihi ọgbụgba ndụ a. 19Ma ndịisi Izrel kwuru sị, “Anyị aṅụọla iyi nʼihu Onyenwe anyị, Chineke Izrel sị, na anyị agaghị emetụ ha aka, ugbu a kwa anyị agaghị eme ha ihe ọbụla. 20Ma nke a ka anyị ga-eme. Anyị ga-ekwe ka ha dị ndụ, nʼihi na ọ bụrụ na anyị emezughị iyi anyị ṅụrụ, iwe Onyenwe anyị ga-adakwasị anyị niile.” 21Ya mere, ndịisi kwukwara sị, “Anyị ga-ahapụ ha ka ha dịrị ndụ, kama ha ga-aghọ ohu ndị Izrel, ndị ga na-awara anyị nkụ na ndị ga na-ekutere anyị mmiri.” Nʼụzọ dị otu a, e mere ka ha dịrị ndụ. 22Emesịa, Joshua ziri ozi kpọọ ndịisi obodo Gibiọn jụọ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji ghọgbuo anyị site nʼịgwa anyị, ‘Anyị bi nʼebe dịpụrụ anya, site nʼebe unu bi,’ ebe ọ bụ na unu bi anyị nso?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.