Joshua 7:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ.
Joshua 7:25 in English
Joshua 7:25 · Berean Standard Bible
“Why have you brought this trouble upon us?” said Joshua. “Today the LORD will bring trouble upon you!” And all Israel stoned him to death. Then they stoned the others and burned their bodies.
Context
23Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. 24Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ. 25Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.”
Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ. 26Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa.
7:1 Zabdi, dị na nsụgharị Griik nke akwụkwọ nsọ e dere nʼasụsụ Hibru.
7:14 Ọ bụ nkume abụọ a na-eji ajụta ase nʼihu Chineke, nke a na-akpọ Urim na Tumim, ka ha ji chọpụta eziokwu banyere ihe mere. Ọpụ 28:30; Lev 8:8; Ọnụ 27:21; 1Sa 28:6; Ezr 2:63; Neh 7:63-65
7:21 Nʼasụsụ ndị Hibru, ihe e ji mara Babilọn bụ Shaịna. Jen 10:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.