Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ.

Joshua 7:24 in English

Joshua 7:24 · Berean Standard Bible

Then Joshua, together with all Israel, took Achan son of Zerah, the silver, the cloak, the bar of gold, his sons and daughters, his oxen and donkeys and sheep, his tent, and everything else he owned, and brought them to the Valley of Achor.

Context

22Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ. 23Ha chịkọtara ha niile chịtara ha Joshua. Mgbe ha bịaruru ebe Joshua na ndị Izrel niile nọ, ha chịsara ya nʼala nʼihu Onyenwe anyị. 24Mgbe ahụ, Joshua na ndị Izrel niile, duuru Ekan, nwa Zera, chịkọrọkwa ọlaọcha ahụ, na uwe mwụda ahụ, na mkpirisi ọlaedo ahụ, na ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom, na ehi na ịnyịnya ibu ya, na igwe ewu na atụrụ ya, na ụlọ ikwu ya, na ihe niile o nwere, gaa na Ndagwurugwu Akọ. 25Mgbe ahụ, Joshua sịrị, “Gịnị mere i ji wetara anyị nsogbu ndị a? Onyenwe anyị ga-eme ka nsogbu dakwasịkwa gị onwe gị taa.” Ndị Izrel niile weere nkume tugbuo ha nʼebe ahụ. Emesịa, a kpọrọ ha ọkụ. 26Ha tụkọtara ọtụtụ nkume tụkwasị ya nʼelu Ekan. Nkume ndị a dị nʼebe ahụ ruo taa. Ọ bụkwa nʼụzọ dị otu a ka iwe ọkụ Onyenwe anyị ji dajụọ. Ya mere, e ji akpọ ebe ahụ Ndagwurugwu Akọ ruo taa. 7:1 Zabdi, dị na nsụgharị Griik nke akwụkwọ nsọ e dere nʼasụsụ Hibru. 7:14 Ọ bụ nkume abụọ a na-eji ajụta ase nʼihu Chineke, nke a na-akpọ Urim na Tumim, ka ha ji chọpụta eziokwu banyere ihe mere. Ọpụ 28:30; Lev 8:8; Ọnụ 27:21; 1Sa 28:6; Ezr 2:63; Neh 7:63-65 7:21 Nʼasụsụ ndị Hibru, ihe e ji mara Babilọn bụ Shaịna. Jen 10:10

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.