Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ.

Joshua 6:8 in English

Joshua 6:8 · Berean Standard Bible

After Joshua had spoken to the people, seven priests carrying seven rams’ horns before the LORD advanced and blew the horns, and the ark of the covenant of the LORD followed them.

Context

6Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.” 7Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.” 8Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ. 9Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a. 10Ma Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Unu emela mkpọtụ agha ọbụla, maọbụ kwee ka anụ olu unu, maọbụ kwuo okwu ọbụla, tutu ruo ụbọchị m ga-asị unu tie mkpu. Mgbe m nyere unu iwu a, tienụ ezi mkpu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.