Joshua 6:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.”
Joshua 6:7 in English
Joshua 6:7 · Berean Standard Bible
And he told the people, “Advance and march around the city, with the armed troops going ahead of the ark of the LORD.”
Context
5Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.” 6Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.” 7Mgbe ahụ Joshua nyere ndị Izrel iwu sị ha, “Zọlịenụ ije! Gbaanụ obodo a gburugburu, ka ndị agha na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.” 8Mgbe Joshua gwachara ndị Izrel okwu, ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike nʼaka ha, nʼihu Onyenwe anyị, gafere nʼihu na-afụ opi ike ha. Ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị sochiri ha azụ. 9Ndị agha na-aga nʼihu ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi ike, ebe ndị agha ndị ọzọ na-esote igbe ọgbụgba ndụ nʼazụ. Nʼoge a niile ha na-azọ ije, ndị na-afụ opi ike gara nʼihu na-eme nke a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.