Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.”

Joshua 6:22 in English

Joshua 6:22 · Berean Standard Bible

Meanwhile, Joshua told the two men who had spied out the land, “Go into the house of the prostitute and bring out the woman and all who are with her, just as you promised her.”

Context

20Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ. 21Ha debere obodo a iche nye Onyenwe anyị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya. 22Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.” 23Ya mere, ụmụ okorobịa abụọ ahụ bụ ndị mere nledo ala ahụ, bara nʼụlọ ahụ, kpọpụta Rehab na nna ya na nne ya na ụmụnne ya na ndị ikwu ya niile. Ha kpọpụtara ndị ezinaụlọ ya niile debe ha nʼotu ebe nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel. 24Ha kpọrọ obodo ahụ ọkụ, ya na ihe niile dị nʼime ya. Ma ha wepụtara naanị ọlaọcha na ọlaedo, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, tinye nʼụlọakụ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.