Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ.

Joshua 6:20 in English

Joshua 6:20 · Berean Standard Bible

So when the rams’ horns sounded, the people shouted. When they heard the blast of the horn, the people gave a great shout, and the wall collapsed. Then all the people charged straight into the city and captured it.

Context

18Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile. 19Ma ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na ihe niile e ji bronz na igwe kpụọ, ka a ga-edo iche nye Onyenwe anyị. A ga-ewebata ha nʼụlọakụ Onyenwe anyị.” 20Mgbe ụda opi ike ahụ dasiri ike, ndị agha tiri mkpu, na ụda opi ike ahụ. Mgbe ndị ikom tiri oke mkpu, mgbidi ahụ dara dapịasịa, nke mere na onye ọbụla chere ihu banye nʼime obodo ahụ, lụgbuo obodo ahụ. 21Ha debere obodo a iche nye Onyenwe anyị site nʼiji mma agha ha gbuchapụ ihe niile dị ndụ nʼobodo ahụ, ma nwoke, ma nwanyị, ma nwantakịrị, ma okenye, ma ehi, ma atụrụ, ma ịnyịnya ibu, ihe niile dị nʼime ya. 22Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị ikom abụọ ahụ buru ụzọ gaa nnyochapụta obodo ahụ anya sị ha, “Mezuonụ nkwa unu kwere. Gaanụ nʼụlọ nwanyị akwụna, kpọpụta ya na ndị niile dị nʼụlọ ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.