Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.” 23:8 Dit 10:20

Joshua 23:16 in English

Joshua 23:16 · Berean Standard Bible

If you transgress the covenant of the LORD your God, which He commanded you, and go and serve other gods and bow down to them, then the anger of the LORD will burn against you, and you will quickly perish from this good land He has given you.”

Context

14“Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma Onyenwe anyị Chineke unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị. 15Ma dịka ezi nkwa niile Onyenwe anyị Chineke unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka Onyenwe anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu. 16Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.” 23:8 Dit 10:20

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.