Joshua 22:28
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’
Joshua 22:28 in English
Joshua 22:28 · Berean Standard Bible
Therefore we said, ‘If they ever say this to us or to our descendants, we will answer: Look at the replica of the altar of the LORD that our fathers made, not for burnt offerings or sacrifices, but as a witness between us and you.’
Context
26“Ọ bụ nke a mere anyị ji kpebie sị, ‘Ka anyị jikere wuo ebe ịchụ aja, ma ọ bụghị ebe ịchụ aja nsure ọkụ maọbụ aja ndị ọzọ,’ 27Kama, ọ bụ ebe ịchụ aja* ịhụba ama nʼetiti unu na anyị, nakwa ọgbọ ndị nke ga-esote anyị, na anyị ga-efe Onyenwe anyị ofufe nʼụlọnsọ ya, site na ịchụrụ ya aja nsure ọkụ, na aja udo. Mgbe ahụ, nʼoge dị nʼihu, ụmụ ụmụ unu agaghị asị ụmụ ụmụ anyị, ‘Unu enweghị oke nʼime Onyenwe anyị Chineke.’ 28“Echiche obi anyị bụ na ọ bụrụ na ụmụ ụmụ unu ekwuo ihe dị otu a, ụmụ anyị ga-azaghachi ha sị, ‘Lee ebe ịchụ aja nna anyị ha wuru, nke yiri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. E wughị ya maka ịchụ aja nsure ọkụ, kama e wuru ya dịka ihe ama na-egosi nnwekọ dị nʼetiti anyị na unu.’ 29“Anyị agaghị enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ; anyị agaghị esitekwa nʼiso Onyenwe anyị Chineke wezuga onwe anyị, site nʼiwuru onwe anyị ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka maọbụ ụdị aja ọzọ dị iche iche. Ebe ịchụ aja anyị maara bụ ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke anyị, nke guzo nʼihu ụlọ nzute ya.” 30Mgbe Finehaz onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ ahụ, bụ ndịisi ezinaụlọ ndị Izrel nụrụ ihe ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ụmụ Manase kwuru, ọ masịrị ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.