Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.

Joshua 21:6 in English

Joshua 21:6 · Berean Standard Bible

The descendants of Gershon received thirteen cities by lot from the tribes of Issachar, Asher, Naphtali, and the half-tribe of Manasseh in Bashan.

Context

4Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja. 5Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase. 6Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ. 7Ụmụ Merari dịka ikwu ha si dị ketara obodo iri na abụọ site nʼala ndị ebo Ruben, na Gad, na Zebụlọn. 8Ya mere, ụmụ Izrel mezuru iwu niile Onyenwe anyị nyere Mosis site nʼikenye ndị Livayị obodo ha ga-ebi, nakwa ebe anụ ụlọ ha ga-ata nri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.