Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja.

Joshua 21:4 in English

Joshua 21:4 · Berean Standard Bible

The first lot came out for the Kohathite clans. The Levites who were descendants of Aaron the priest received thirteen cities by lot from the tribes of Judah, Simeon, and Benjamin.

Context

2na Shaịlo, nʼime ala Kenan, sị ha, “Onyenwe anyị nyere iwu site nʼaka Mosis ka enye anyị obodo ụfọdụ ebe anyị ga-ebi, na ala ebe anụ ụlọ anyị ga na-ata ahịhịa.” 3Nʼihi nke a, dịka iwu Onyenwe anyị si dị, ụmụ Izrel sitere nʼihe nketa ha nye ndị Livayị obodo ụfọdụ, nyekwa ha ala ebe anụ ụlọ ha ga-anọ taa nri. 4Ndị buru ụzọ nweta oke site nʼife nza bụ ikwu Kohat dịka ikwu ha si dị. E sitere nʼala ndị Juda, na Simiọn, na Benjamin nye ha obodo iri na atọ, ka ọ bụrụ ihe nketa ụmụ Kohat ndị si nʼebo Livayị, ndị bụkwa ụmụ ụmụ Erọn onye nchụaja. 5Ma ndị fọdụrụ nʼụmụ Kohat ka e nyere obodo iri site nʼobodo nke ikwu ndị ebo Ifrem, na Dan, na ọkara ebo Manase. 6Ụmụ Geshọn nwetara obodo iri na atọ site nʼife nza. Obodo ha nwetara dị na Bashan. Ha sikwa nʼala ndị ikwu ebo Isaka na Asha, na Naftalị, na ọkara ebo Manase nweta oke ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.