Joshua 19:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ.
Joshua 19:14 in English
Joshua 19:14 · Berean Standard Bible
Then the border circled around the north side of Neah to Hannathon and ended at the Valley of Iphtah-el.
Context
12O si na Sarid chigharịa ihu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ahụ ruru nʼoke ala Kislọt Teboa, gbagorokwa ruo Daberat, ruokwa Jafia. 13Ọ gbatịkwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo Gat Hefa, Et Kazin na Rimọn, tụgharịa nʼụzọ e si aga Nea. 14Nʼebe ahụ, ọ gara gburugburu nʼakụkụ ugwu ruo Hanatọn, ruokwa na Ndagwurugwu Ifta El ebe ọ sọtụrụ. 15Obodo ndị a niile dịkwa nʼime ihe nketa ụmụ Zebụlọn: Katat, Nahalal, Shịmrọn, Idala na Betlehem.* Obodo niile ndị a dị iri na abụọ, tinyere obodo nta niile gbara ha gburugburu. 16Obodo ndị a niile na obodo nta ha, so nʼala ụmụ Zebụlọn nwetara dịka ihe nketa ha, dịka ikwu ha si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.