Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.”

Joshua 17:15 in English

Joshua 17:15 · Berean Standard Bible

Joshua answered them, “If you have so many people that the hill country of Ephraim is too small for you, go to the forest and clear for yourself an area in the land of the Perizzites and the Rephaim.”

Context

13Ma nʼikpeazụ, mgbe ụmụ Izrel ghọrọ ndị dị ike, ha achụpụghị ndị Kenan niile bi nʼobodo ndị a kpamkpam, kama ha mere ka ha bụrụ ndị na-ejere ụmụ Izrel ozi, dịka ndị ohu ha. 14Ma ụmụ ụmụ Josef* sịrị Joshua, “Gịnị mere i ji nye anyị naanị otu ụzọ ala ka ọ bụrụ ihe nketa anyị? Ị hụrụ na Onyenwe anyị gọziri anyị mee ka ọnụọgụgụ anyị baa ụba.” 15Joshua zara sị ha: “Ọ bụrụ na ala ugwu ugwu Ifrem agaghị ezuru unu nʼihi na unu bara ụba nʼọnụọgụgụ, gaanụ nʼoke ọhịa sụchasịa ala, nʼime ala ndị Periz, na nke ndị Refaim.” 16Ụmụ Josef zara Joshua sị, “Ala ugwu ugwu a agaghị ezuru anyị. Ọzọ, ndị Kenan niile bi nʼala dị larịị nwere ụgbọala igwe, ma ndị niile bi na Bet-Shan, na ụmụ obodo nta ha na ndị bikwa na Ndagwurugwu Jezril.” 17Ma Joshua zara ụmụ Josef, ya bụ, Ifrem na Manase, sị ha, “Unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị dị ike, ọ bụghị naanị otu oke ka unu ga-eketa,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.