Joshua 16:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase.
Joshua 16:9 in English
Joshua 16:9 · Berean Standard Bible
along with all the cities and villages set apart for the descendants of Ephraim within the inheritance of Manasseh.
Context
7O sitere na Janoa gbadaa ruo Atarọt, na Naara, bịaruo Jeriko, gafee, kwụsị nʼosimiri Jọdan. 8Oke ala ahụ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ sitere na Tapụọa gaa ruo iyi Kana, na ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ ala ebo Ifrem ketara, dịka ikwu ha si dị. 9E tinyere obodo ukwu na obodo nta niile ekepụtara iche nʼihi ebo Ifrem nʼetiti ihe nketa ụmụ Manase. 10Ma ha achụpụghị ndị Kenan ndị bi na Gaza.* Nʼihi nke a, ndị Kenan binyere ndị Ifrem ruo taa, ma e mere ka ha bụrụ ndị ọrụ ngo.
16:10 Jos 15:63; 17:12-13; Nkp 1:29
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.