Joshua 15:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba,* rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben.
Joshua 15:6 in English
Joshua 15:6 · Berean Standard Bible
went up to Beth-hoglah, proceeded north of Beth-arabah, and went up to the Stone of Bohan son of Reuben.
Context
4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda. 5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan.
Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, 6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba,* rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben. 7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel. 8Oke ala ahụ gbagoro Ndagwurugwu nke Ben Hinom, rukwaa nʼakụkụ ndịda Jebus nʼebe e wuru obodo Jerusalem. Oke ala ahụ sitekwara ebe ahụ gbagoo ruo nʼelu dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke Ndagwurugwu Hinom, na nsọtụ ugwu nke Ndagwurugwu Refaim.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.