Joshua 15:5
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan. Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan,
Joshua 15:5 in English
Joshua 15:5 · Berean Standard Bible
The eastern border was the Salt Sea as far as the mouth of the Jordan. The northern border started from the bay of the sea at the mouth of the Jordan,
Context
3Site nʼebe akụkụ ndịda nrigo Akrabim, gafee ruo nʼọzara Zin, ma rigoo nʼakụkụ nke ndịda Kadesh Banea, gafee Hezrọn rigoruo na Aada, gba gburugburu gaa Kaka; 4site nʼebe ahụ ruo Azmọn, pụọ gbasoro iyi dị nʼoke ala ndị Ijipt gagide ruo nʼosimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala nʼebe ndịda. 5Oke ala ha nʼọwụwa anyanwụ bụ oke osimiri Nnu, ruo nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan.
Oke ala ha nʼakụkụ ugwu bidoro nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, 6gbatịrị ruo Bet-Hogla, ma ruo nʼugwu Bet-Araba,* rukwaa na nkume Bohan, nwa Ruben. 7Site nʼebe ahụ, ọ gbatịrị ruo na Ndagwurugwu Akọ na Debịa, tụgharịa gbatịrịkwa ruo Gilgal, na ncherita ihu ala ala Adumim nke dị nʼakụkụ ndịda ndagwurugwu ahụ. Site nʼebe ahụ ọ gbatịrị ruo na mmiri En-Shemesh, kwụsị na En-Rogel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.