Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu.

Joshua 13:6 in English

Joshua 13:6 · Berean Standard Bible

All the inhabitants of the hill country from Lebanon to Misrephoth-maim—all the Sidonians—I Myself will drive out before the Israelites. Be sure to divide it by lot as an inheritance to Israel, as I have commanded you.

Context

4site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait; 5na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat. 6“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu. 7Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.” 8Ọkara ebo Manase, na ebo Ruben, na Gad, enwetala ihe nketa ha nʼofe ọzọ nke Jọdan, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, dịka Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.