Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.

Joshua 13:5 in English

Joshua 13:5 · Berean Standard Bible

the land of the Gebalites;* and all Lebanon to the east, from Baal-gad below Mount Hermon to Lebo-hamath.

Context

3site nʼosimiri Shaịho dị nʼọnụ Ijipt ruo nʼoke ala Ekrọn, nʼakụkụ ugwu ya, nke a gụnyere ndị Kenan, na ndịisi ise ndị Filistia: ndị Gaza, ndị Ashdọd, ndị Ashkelọn, ndị Gat, na ndị Ekrọn; nakwa ala ndị Ava, 4site na ndịda ala ahụ niile dị nʼugwu; nʼala ndị Kenan, na Meara, nke bụ ala ndị Saịdọn, ruo nʼAfek, na oke ala ndị Amọrait; 5na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat. 6“Ndị niile bi nʼala ugwu site na Lebanọn ruo Mizrefot Maim, ya bụ, ndị Saịdọn niile, Mụ onwe m ga-achụpụ ha site nʼihu ụmụ Izrel. Ihe dịrị gị bụ ike ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa nye ndị Izrel, dịka mụ onwe m nyere gị iwu. 7Ya mere, kere ebo itoolu, na ọkara Manase, ala ndị a niile, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.