Joshua 11:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha.
Joshua 11:7 in English
Joshua 11:7 · Berean Standard Bible
So by the waters of Merom, Joshua and his whole army came upon them suddenly and attacked them,
Context
5Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha. 6Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.” 7Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha. 8Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ. 9Joshua na ndị agha ya mere ha ihe Onyenwe anyị kwuru na a ga-eme ha. Ha gbupụrụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, surekwaa ụgbọ agha ha niile nʼọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.