Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.”

Joshua 11:6 in English

Joshua 11:6 · Berean Standard Bible

Then the LORD said to Joshua, “Do not be afraid of them, for by this time tomorrow I will deliver all of them slain before Israel. You are to hamstring their horses and burn up their chariots.”

Context

4Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha. 5Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha. 6Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Atụla ha egwu, nʼihi na echi, nʼoge dịka ugbu a, aga m ewere ha niile nʼọnọdụ ndị egburu egbu nyefee ha nʼaka Izrel. Ị ga-ebipụ nkwonkwo ụkwụ ịnyịnya ha niile, kpọọkwa ụgbọ agha ha niile ọkụ.” 7Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha. 8Onyenwe anyị nyefere ndị agha ha nʼaka ndị Izrel, ndị lụgburu ha, chụọ ha ọsọ ruo nʼoke ala Saịdọn, ruokwa ebe a na-akpọ Mizrefot Maim, na ruo nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼime Ndagwurugwu Mizpa. Ya mere, o nweghị ọ bụladị otu onye iro a hapụrụ ndụ nʼagha ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.