Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.

Joshua 11:20 in English

Joshua 11:20 · Berean Standard Bible

For it was of the LORD to harden * their hearts to engage Israel in battle, so that they would be set apart for destruction and would receive no mercy, being annihilated as the LORD had commanded Moses.

Context

18O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha. 19Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi. 20Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 21Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi. 22Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.