Joshua 11:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi.
Joshua 11:19 in English
Joshua 11:19 · Berean Standard Bible
No city made peace with the Israelites except the Hivites living in Gibeon; all others were taken in battle.
Context
17Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile. 18O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha. 19Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi. 20Nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị, nʼonwe ya, mere ka ndị eze ahụ nyịchie obi ha, ka ha lụso Izrel agha, ka o si otu a laa ha nʼiyi, kpochapụkwa ha niile, na-emereghị ha amara, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 21Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.