Joshua 10:31
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha.
Joshua 10:31 in English
Joshua 10:31 · Berean Standard Bible
And Joshua and all Israel with him moved on from Libnah to Lachish. They laid siege to it and fought against it.
Context
29Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha. 30Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko. 31Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha. 32Ma Onyenwe anyị nyefere Lakish nʼaka ụmụ Izrel. Joshua lụgburu ya nʼụbọchị nke abụọ ya. Ha weere mma agha ha tigbuo mmadụ niile bi nʼime ya, dịka ha mere Libna. 33Ma mgbe a na-alụ agha na Lakish, Horam eze Gaza, duuru ndị agha ya bịa inyere ndị obodo Lakish aka, ka ha si otu a gbochie ndị agha Izrel ịbata nʼime ya. Ma ndị agha Joshua gburu ya, laa ndị agha ya niile nʼiyi, ruo na ọ fọdụghị otu onye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.