Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha.

Joshua 10:29 in English

Joshua 10:29 · Berean Standard Bible

Then Joshua and all Israel with him moved on from Makkedah to Libnah and fought against Libnah.

Context

27Ma mgbe anwụ bidoro ịda, Joshua nyere iwu ka e site nʼosisi wedata ozu ndị eze ise ahụ, tụba ha nʼime ọgba nkume ahụ, ebe ha zoro onwe ha. Ha ji nkume dị ukwuu mechie ọnụ ọgba nkume ahụ. Nkume ukwuu ahụ dịkwa nʼebe ahụ ruo taa. 28Nʼotu ụbọchị ahụ, Joshua lara obodo Makeda nʼiyi, jiri mma agha gbuo eze ya, na onye ọbụla bi nʼime ya. Ọ dịkwaghị onye ọbụla nọ nʼime obodo ahụ ọ hapụrụ ndụ. Otu ihe ahụ o mere eze Jeriko ka o mere eze Makeda. 29Joshua na ndị Izrel niile so ya sitere na Makeda gaa na Libna lụso ya agha. 30Onyenwe anyị nyekwara obodo a na eze ya nʼaka Izrel. Joshua weere mma agha ya tigbuo mmadụ niile dị nʼime ya. O nweghị onye ọbụla nke ọ hapụrụ ndụ nʼebe ahụ. O mekwara eze obodo a ihe o mere eze Jeriko. 31Site na Libna, Joshua na ndị Izrel gara ruo Lakish, lụso ha agha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.