Job 5:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ; chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha.
Job 5:20 in English
Job 5:20 · Berean Standard Bible
In famine He will redeem you from death, and in battle from the stroke of the sword.
Context
18Nʼihi na ọ na-etihịa mmadụ ahụ ma na-ekechikwa ọnya ha;
Ọ na-eti mmadụ ihe, ma aka ya na-agwọkwa. 19Ọ ga-anapụta gị site nʼụzọ nsogbu isii,
mee ka ihe ọjọọ hapụ irute gị na nsogbu nke asaa. 20Ọ ga-echebe gị ka ị hapụ ịnwụ nʼoge ụnwụ;
chebekwa gị ka mma agha hapụ ịmetụ gị nʼoge agha. 21Ị ga-abụ onye a na-echebe site na nkwutọ nke ire ndị ga-ekwutọ gị.
Ị gaghị atụkwa egwu mgbe mbibi bịara. 22Ị ga-achị ọchị nʼoge ụnwụ na nʼoge mbibi,
ị gaghị atụkwa egwu ajọ anụ ọhịa dị iche iche.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.