Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba; nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji.
Job 4:5 in English
Job 4:5 · Berean Standard Bible
But now trouble has come upon you, and you are weary. It strikes you, and you are dismayed.
Context
3Lee ka i siri nye ọtụtụ mmadụ ndụmọdụ,
na ka i si mee ka ndị na-ada mba nwee ume. 4Okwu ọnụ gị abụrụla ihe ịgbaume nye ọtụtụ mmadụ,
ị bụrụla ịgbaume nye ndị ikpere ha na-ama jijiji. 5Ma leenụ ugbu a, nsogbu abịakwasịla gị, ị bụrụla onye na-ada mba;
nsogbu etiela gị aka, i na-ama jijiji. 6Egwu ị na-atụ Chineke ọ gaghị abụ ihe ịgbaume nye gị,
izi ezi nke ndụ gị abụrụkwa olileanya gị? 7“Chee echiche ugbu a! Onye, bụ onye aka ya dị ọcha, nke a larala nʼiyi?
Ebee ka i hụrụ ka e bibiri ndị na-eme ihe ziri ezi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.