Job 28:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
Job 28:3 in English
Job 28:3 · Berean Standard Bible
Man puts an end to the darkness; he probes the farthest recesses for ore in deepest darkness.
Context
1Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị;
ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa. 2E si nʼime ala ewepụta igwe,
ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla. 3Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ;
ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya,
na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị. 4Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi,
nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru,
nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.* 5Ala ahụ e si na ya enweta nri,
abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.