Job 1:15
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ndị Sheba* bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”
Job 1:15 in English
Job 1:15 · Berean Standard Bible
the Sabeans swooped down and took them away. They put the servants to the sword, and I alone have escaped to tell you!”
Context
13Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye. 14Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso, 15ndị Sheba* bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.” 16Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.” 17Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa* kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.