Job 1:13
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye.
Job 1:13 in English
Job 1:13 · Berean Standard Bible
One day, while Job’s sons and daughters were eating and drinking wine in their oldest brother’s house,
Context
11Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.” 12Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.”
Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. 13Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye. 14Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso, 15ndị Sheba* bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.