Native Bible

John 9:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya.

John 9:38 in English

John 9:38 · Berean Standard Bible

“Lord, I believe,” he said. And he worshiped Jesus.

Context

36Ọ zara sị, “Onyenwe m, ọ bụ onye? Gwa m ka m nwe ike ikwere na ya.” 37Jisọs sịrị ya, “Ị hụla ya ugbu a; onye gị na ya na-ekwurịta okwu bụ onye ahụ.” 38Ọ sịrị, “Onyenwe m, ekwela m.” Ọ kpọrọ isiala nye ya. 39Jisọs sịrị, “Ọ bụ nʼihi ikpe ka m ji bịa nʼụwa, ka ndị na-adịghị ahụ ụzọ bido ịhụ ụzọ, na ka ndị na-ahụ ụzọ ghọọ ndị kpuru ìsì.” 40Mgbe ụfọdụ ndị Farisii nọ nso nʼebe ahụ nụrụ nke a, ha sịrị ya, “Anyị onwe anyị, anyị bụkwa ndị kpuru ìsì?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.