Jọn 9:26
John 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?”
John 9:26 in English
John 9:26 · Berean Standard Bible
“What did He do to you?” they asked. “How did He open your eyes?”
Context
24Ha kpọrọ nwoke a nke ugboro abụọ, bụ onye ahụ kpuburu ìsì, sị ya, “Nye Chineke otuto. Anyị maara na nwoke a bụ onye mmehie.” 25Ọ zara, “Amaghị m maọbụ onye mmehie ma ọ bụghị. Ma otu ihe ka m maara, ekpuru m ìsì na mbụ ma ugbu a ana m ahụ ụzọ.” 26Ha sịrị ya, “Gịnị ka o mere gị? Olee otu o si meghe anya gị?” 27Ọ zara ha, “Agwala m unu ihe niile, ma unu achọghị ikwere. Gịnị mere unu ji chọọ ịnụ ya ọzọ? Unu chọkwara ịghọ ndị na-eso ụzọ ya?” 28Ha bigbọrọ ya sị, “Gị onwe gị bụrụkwa onye na-eso ụzọ ya! Anyị bụ ndị na-eso ụzọ Mosis.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.