Jọn 8:14
John 8:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga.
John 8:14 in English
John 8:14 · Berean Standard Bible
Jesus replied, “Even if I testify about Myself, My testimony is valid, because I know where I came from and where I am going. But you do not know where I came from or where I am going.
Context
12Ọzọ, Jisọs gwara ha sị, “Abụ m ihe nke ụwa. Onye ọbụla na-eso m agaghị ejegharị nʼọchịchịrị, kama ọ ga-enwe ìhè nke ndụ.” 13Ndị Farisii sịrị, “Ị na-agbara onwe gị ama! Ya mere ama ị na-agbara onwe gị abụghị ezie.” 14Ma Jisọs zara sị, “A sịkwarị na mụ na-agbara onwe m ama, ama m na-agba bụ eziokwu. Nʼihi na-amara m ebe m si bịa, marakwa m ebe m na-aga. Ma unu aghọtaghị ebe m si bịa, maọbụ ebe m na-aga. 15Unu na-ekpe ikpe dị ka mmadụ; ma ekpeghị m onye ọbụla ikpe. 16Ma ọ bụrụ na m ekpe ikpe, ikpe m bụ eziokwu nʼihi na ọ bụghị naanị m nọ, kama ọ bụ mụ na Nna m, onye zitere m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.