Native Bible

John 7:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?”

John 7:42 in English

John 7:42 · Berean Standard Bible

Doesn’t the Scripture say that the Christ will come from the line of David and from Bethlehem, the village where David lived?*”

Context

40Mgbe ha nụrụ nke a, ụfọdụ nʼime igwe mmadụ ahụ sịrị, “Nʼeziokwu onye a bụ onye amụma ahụ.” 41Ndị ọzọ sịrị, “Ọ bụ Kraịst ahụ.” Ma ndị nke ọzọ sịkwara, “Nʼezie Kraịst ahụ, ọ ga-esi na Galili pụta? 42Ọ bụ na akwụkwọ nsọ ekwughị na Kraịst ga-esi nʼagbụrụ Devid pụta, na Betlehem bụ obodo Devid?” 43Ya mere nkewa dapụtara nʼetiti igwe mmadụ ahụ nʼihi ya. 44Ụfọdụ chọrọ ijide ya ma ọ dịghị onye ọbụla metụrụ ya aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.