Native Bible

John 6:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe.

John 6:18 in English

John 6:18 · Berean Standard Bible

A strong wind was blowing, and the sea grew agitated.

Context

16Mgbe o ruru nʼuhuruchi, ndị na-eso ụzọ ya rịdara gaa nʼọnụ mmiri, 17ebe ha banyere nʼotu ụgbọ mmiri, malite ịgabiga osimiri gawa nʼofe Kapanọm. Nʼoge a ọchịchịrị agbaala ma Jisọs alọghachikwutebeghị ha. 18Ebili mmiri maliri elu nʼihi nʼoke ifufe bidoro na-efe. 19Ha akwọọla ụgbọ ihe dịka kilomita ise maọbụ isii, mgbe ha hụrụ Jisọs ka ọ na-aga ije nʼelu mmiri ahụ na-abịa nso nʼụgbọ mmiri ha. Oke egwu tụkwara ha. 20Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.